Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Timọti 2:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru.

19. Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya.

20. Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere.

21. Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n'ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n'ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula.

22. Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.

23. Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù.

24. Ma orù nke Onye-nwe-ayi aghaghi ibu onye nādighi-alu ọ̀gù, kama ọ ghaghi idi nwayọ n'ebe madu nile nọ, ọ ghaghi kwa ibu onye nwere ike izí ihe, onye nānagide ihe ọjọ,

25. n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu,

26. we teta n'ura manya pua n'ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Timọti 2