Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Pita 3:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi m'huru n'anya, nka bu akwukwọ-ozi nke-abua nke m'nēdegara unu ub͕u a; ma nime ha abua ka m'nakpali uche-unu di ọcha n'ichetara unu;

2. ka unu we cheta okwu nke ndi-amuma di nsọ buru uzọ kwu, cheta kwa ihe ahu Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, nyere n'iwu site n'ọnu ndi-ozi-unu:

3. ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di,

4. nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.

5. N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke;

6. nke esitere n'aka-ha me ka uwa nke di n'oge ahu la n'iyì, n'ihi na iju-miri rikpuru ya:

7. ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n'otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n'iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke.

8. Ma unu ekwela ka otù ihe a me unu nchefu, ndi m'huru n'anya, na otù ubọchi di ka nnù arọ abua na ọgu iri n'anya Onye-nwe-ayi, nnù arọ abua na ọgu iri di kwa ka otù ubọchi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Pita 3