Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Pita 3:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi m'huru n'anya, nka bu akwukwọ-ozi nke-abua nke m'nēdegara unu ub͕u a; ma nime ha abua ka m'nakpali uche-unu di ọcha n'ichetara unu;

2. ka unu we cheta okwu nke ndi-amuma di nsọ buru uzọ kwu, cheta kwa ihe ahu Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, nyere n'iwu site n'ọnu ndi-ozi-unu:

3. ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di,

4. nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.

5. N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke;

6. nke esitere n'aka-ha me ka uwa nke di n'oge ahu la n'iyì, n'ihi na iju-miri rikpuru ya:

7. ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n'otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n'iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke.

8. Ma unu ekwela ka otù ihe a me unu nchefu, ndi m'huru n'anya, na otù ubọchi di ka nnù arọ abua na ọgu iri n'anya Onye-nwe-ayi, nnù arọ abua na ọgu iri di kwa ka otù ubọchi.

9. Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n'ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n'ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n'iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari.

10. Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.

11. Ebe anēme ka ihe ndia nile la n'iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n'ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Pita 3