Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 7:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Ya mere asi na ọ bu ezie na edegaram unu akwukwọ, ọ bughi n'ihi onye ahu mere ajọ omume ka m'dere ya, ọ bughi kwa n'ihi onye ahu emere ajọ omume megide ya, kama ka ewe me ka inu-ọku-n'obi unu nānu n'ihi ayi putara unu ìhè n'iru Chineke.

13. N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ.

14. N'ihi na asi na ọ di ihe m'nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n'ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m'nyara n'iru Taitọs, bu ezi-okwu.

15. Obi-ya dibigara ókè n'ebe unu nọ, mb͕e ọ nēcheta iṅa-nti nke unu nile, otú unu were egwu na ima-jijiji nara ya nke-ọma.

16. Anamaṅuri ọṅu na enwerem obi-ike n'ihe nile n'aru unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 7