1. Ma ezuputaram onwem nka, na m'gaghi-abiakute unu ọzọ n'ihe-nwuta.
2. N'ihi na asi na mu onwem eme ka o wuta unu, ònye bu kwa onye gēme ka obi tọm utọ, ma-ọbughi onye ahu nke anēme ka o wuta ya site na mu onwem?
3. Ede-kwa-ram otù ihe nka n'akwukwọ, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m'biara n'aka ndi o kwesiri ka m'ṅuria ọṅu n'aru ha; ebe m'tukwasiworo obi n'ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile.
4. N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari.