Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 11:9-26 Bible Nso (IGBOB)

9. mb͕e m'nọ-kwa-ra n'etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n'ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n'uzọ nile ọ bula ka m'ghara inyib͕u unu, otú a ka m'gēdebe kwa onwem.

10. Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n'akuku nile nke Akaia.

11. N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara.

12. Ma ihe m'nēme ka m'gēme kwa, ka m'we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n'ihe ha nānya isi.

13. N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.

14. Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.

15. Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.

16. Asim ọzọ, Ka madu ọ bula ghara ichè na abum onye nēnweghi uche: ma ọ buru na unu emeghi otú a, otú ọ di naranum nke-ọma dika onye nēnweghi uche, ka mu onwem we nya kwa isi nke-ntà.

17. Ihe m'nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n'enweghi-uche, n'ihe m'dabere we nānya isi.

18. Ebe ọtutu madu nānya isi n'uzọ anu-aru, mu onwem gānya kwa isi.

19. N'ihi na unu were obi-utọ nānagide ndi nēnweghi uche, ebe unu nwere uche.

20. N'ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n'iru.

21. Anamekwu okwu bayere ebubo ihere eboro ayi, dika nka, na ayi onwe-ayi bu ndi nādighi ike. Ma n'uzọ ọ bula onye ọ bula nwere anya-ike (ọ bu n'enweghi-uche ka m'nēkwu), mu onwem nwe-kwa-ra anya-ike.

22. Hà bu ndi-Hibru? mu onwem bu kwa. Hà bu ndi Israel? mu onwem bu kwa. Hà bu nkpuru Abraham? mu onwem bu kwa.

23. Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.

24. Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n'ọgu ube-utari abua.

25. Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m'nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m'nọworo nime ob͕u-miri;

26. n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 11