Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 11:25-33 Bible Nso (IGBOB)

25. Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m'nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m'nọworo nime ob͕u-miri;

26. n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha;

27. n'idọb͕u onwem n'ọlu na ihuju-anya, n'imu-anya ọtutu mb͕e, n'oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n'obubu-ọnu ọtutu mb͕e, n'oyi na ib͕a-ọtọ.

28. Nāgughi ihe di n'èzí, ihe ahu di nke nānyib͕um kwa-ubọchi, bú ncheb͕u m'nēcheb͕u onwem bayere nzukọ Kraist nile.

29. Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya?

30. Ọ buru na aghaghi m inya isi, m'gānya isi n'ihe nke diri adighi-ikem.

31. Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha.

32. Nime Damaskọs onye-isi ala nke nọ n'okpuru Aretas, bú eze, nēche obodo ndi Damaskọs nche, ijidem:

33. site kwa na window ka esi na mb͕idi radam n'ihe akpara akpa, m'we b͕apu n'aka-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 11