Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi Kọrint 11:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. N'ihi na unu were obi-utọ nānagide ndi nēnweghi uche, ebe unu nwere uche.

20. N'ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n'iru.

21. Anamekwu okwu bayere ebubo ihere eboro ayi, dika nka, na ayi onwe-ayi bu ndi nādighi ike. Ma n'uzọ ọ bula onye ọ bula nwere anya-ike (ọ bu n'enweghi-uche ka m'nēkwu), mu onwem nwe-kwa-ra anya-ike.

22. Hà bu ndi-Hibru? mu onwem bu kwa. Hà bu ndi Israel? mu onwem bu kwa. Hà bu nkpuru Abraham? mu onwem bu kwa.

23. Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.

24. Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n'ọgu ube-utari abua.

25. Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m'nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m'nọworo nime ob͕u-miri;

26. n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha;

27. n'idọb͕u onwem n'ọlu na ihuju-anya, n'imu-anya ọtutu mb͕e, n'oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n'obubu-ọnu ọtutu mb͕e, n'oyi na ib͕a-ọtọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi Kọrint 11