Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Pita 2:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;

3. ọ buru na unu deturu n'ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma;

4. Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,

5. ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.

6. N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si,Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru:Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.

7. Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ,Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;

8. na,Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà;n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.

9. Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:

10. ndi nābughi ndi n'oge gara aga, ma ub͕u a unu bu ndi nke Chineke: ndi anēmereghri ebere, ma ub͕u a unu bu ndi emeworo ebere.

11. Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;

12. nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.

13. Donu onwe-unu n'okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n'ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n'ike n'elu unu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Pita 2