Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Tesalọnaika 5:7-19 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n'abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n'abali.

8. Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.

9. N'ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,

10. Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.

11. N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.

12. Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;

13. ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n'ihi ọlu-ha. Birinu n'udo n'etiti onwe-unu.

14. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.

15. Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.

16. Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;

17. nēkpenu ekpere nēwepughi aka;

18. nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.

19. Unu emenyula Mọ Nsọ;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Tesalọnaika 5