Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Tesalọnaika 5:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n'ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori:

5. n'ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri;

6. ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.

7. N'ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n'abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n'abali.

8. Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.

9. N'ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,

10. Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Tesalọnaika 5