23. Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
24. O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.
25. Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi.
26. Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.
27. Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a.
28. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.