Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Tesalọnaika 5:18-28 Bible Nso (IGBOB)

18. nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.

19. Unu emenyula Mọ Nsọ;

20. unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;

21. nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;

22. unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.

23. Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

24. O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.

25. Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi.

26. Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.

27. Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a.

28. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Tesalọnaika 5