Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Tesalọnaika 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo.

2. Ayi nēkele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu nile, nēcheta unu mb͕e ayi nēkpe ekpere;

3. ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;

4. ebe ayi matara, umu-nna-ayi ndi Chineke huru n'anya, i rọputa unu,

5. na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.

6. Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u;

7. ya mere unu ghọrọ ihe-atù n'ebe ha nile, nọ, bú ndi kwere ekwe nime Masedọnia na nime Akaia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Tesalọnaika 1