Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 2:4-16 Bible Nso (IGBOB)

4. Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

5. ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.

6. Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:

7. kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:

8. nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:

9. kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,Nke nābàghi kwa n'obi madu,Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.

10. Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.

11. N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.

12. Ma ayi onwe-ayi anataghi mọ nke uwa, kama ọ bu Mọ Nke sitere na Chineke; ka ayi we mata ihe nile Chineke were amara nye ayi.

13. Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.

14. Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.

15. Ma onye Mọ Nsọ nāchi nēsikwuputa ihe nile, ma ọ dighi onye ọ bula nēsikwuputa ya onwe-ya.

16. N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi, ka o zí Ya ihe? Ma ayi onwe-ayi nwere uche nke Kraist.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 2