9. n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.
10. Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:
11. ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n'ije-ya n'udo, ka o we biakutem: n'ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.
12. Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.
13. Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.
14. Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya.
15. Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi),
16. ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n'okpuru madu di otú a, na n'okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n'ọlu.
17. Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.
18. N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.
19. Nzukọ Kraist nile nke di n'Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.
20. Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.
21. Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de.
22. Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.
23. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.
24. Ihu-n'anya nkem diyere unu nile nime Kraist Jisus. Amen.