isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 16 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m'nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.

2. Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.

3. Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:

4. ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je.

5. Ma m'gābiakute unu, mb͕e ọ bula m'gāgabigasi nime Masedọnia; n'ihi na agajem igabiga nime Masedọnia;

6. ma eleghi anya na nke unu ka m'gānọgide, ma-ọbu nọbiga kwa na mb͕e oyi, ka unu we dupum n'ijem ebe ọ bula m'nāga.

7. N'ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n'uzọ ijem; n'ihi na anamele anya na m'gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe.

8. Ma m'gānọgide n'Efesọs rue oge Pentikọst;

9. n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.

10. Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:

11. ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n'ije-ya n'udo, ka o we biakutem: n'ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.

12. Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.

13. Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.

14. Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya.

15. Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi),

16. ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n'okpuru madu di otú a, na n'okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n'ọlu.

17. Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.

18. N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.

19. Nzukọ Kraist nile nke di n'Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.

20. Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.

21. Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de.

22. Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.

23. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

24. Ihu-n'anya nkem diyere unu nile nime Kraist Jisus. Amen.