6. ma eleghi anya na nke unu ka m'gānọgide, ma-ọbu nọbiga kwa na mb͕e oyi, ka unu we dupum n'ijem ebe ọ bula m'nāga.
7. N'ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n'uzọ ijem; n'ihi na anamele anya na m'gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe.
8. Ma m'gānọgide n'Efesọs rue oge Pentikọst;
9. n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.
10. Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:
11. ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n'ije-ya n'udo, ka o we biakutem: n'ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.
12. Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.
13. Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.