Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 16:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.

13. Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.

14. Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya.

15. Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi),

16. ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n'okpuru madu di otú a, na n'okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n'ọlu.

17. Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.

18. N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 16