Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 16:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m'nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.

2. Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.

3. Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:

4. ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je.

5. Ma m'gābiakute unu, mb͕e ọ bula m'gāgabigasi nime Masedọnia; n'ihi na agajem igabiga nime Masedọnia;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 16