Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Jọn 5:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.

17. Ajọ omume nile bu nmehie: nmehie di kwa nke nādighi-eweta ọnwu.

18. Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka.

19. Ayi matara na ayi bu ndi si na Chineke puta, uwa dum nātọb͕ọ kwa n'aka ajọ onye ahu.

20. Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.

21. Umu-ntakirim, chenu onwe-unu nche ka unu ghara ikpere arusi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Jọn 5