Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Jọn 4:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.

15. Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.

16. Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.

17. Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka.

18. Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya

19. Ayi onwe-ayi nāhu n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n'anya.

20. Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n'anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n'ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n'anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.

21. Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Jọn 4