Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Jọn 2:22-27 Bible Nso (IGBOB)

22. Onye bu onye-ugha ahu ma-ọbughi onye nāgọ si na Jisus abughi Kraist ahu? Onye nāgọnari Nna-ayi na Ọkpara-Ya, onye a bu onye ahu nēmegide Kraist.

23. Onye ọ bula nke nāgọnari Ọkpara ahu, o nweghi kwa Nna ahu: onye nēkwuputa Ọkpara ahu, o nwe-kwa-ra Nna ahu.

24. Ma unu onwe-unu, ka ihe ahu unu nuru site na mbu digide nime unu. Ọ buru na ihe ahu unu nuru site na mbu adigide nime unu, unu onwe-unu gānọgide kwa nime Ọkpara ahu, nọgide kwa nime Nna-Ya.

25. Nka bu kwa nkwa ahu nke Ya onwe-ya kwere ayi, bú ndu ahu, nke bu ndu ebighi-ebi.

26. Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ bayere ndi nēduhie unu.

27. Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Jọn 2