Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Jọn 2:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Nna-ayi.

14. Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.

15. Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n'uwa, n'anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n'anya, ihu-n'anya nke Nna-ayi adighi nime ya.

16. N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa.

17. Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi.

18. Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.

19. Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.

20. Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n'Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Jọn 2