Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 4:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara.

8. Okwu Jehova we ruem nti, si,

9. Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.

10. N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.

11. M'we za, si ya, Gini bu osisi olive abua ndia nke di n'aka-nri ebe-idọba-oriọna nka na n'aka-ekpe-ya?

12. M'we za nke ub͕ò abua, si ya, Gini bu ngalaba abua nke osisi olive ndia nke nēsi n'ihe ọla-edo abua eji ab͕apu manu b͕apu manu ọla-edo n'onwe-ha?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 4