Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 12:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāchọ ikpochapu mba nile ndi nābia imegide Jerusalem.

10. M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.

11. N'ubọchi ahu oké otiti-aka-n'obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n'obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon.

12. Ala nka gēti kwa aka n'obi, ab͕uru ọ bula iche; ab͕uru ulo Devid iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ulo Netan iche, na ndinyom-ha iche;

13. ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche;

14. ab͕uru nile ndi fọduru, ab͕uru ọ bula iche, na ndinyom-ha iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 12