Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 12:11-14 Bible Nso (IGBOB)

11. N'ubọchi ahu oké otiti-aka-n'obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n'obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon.

12. Ala nka gēti kwa aka n'obi, ab͕uru ọ bula iche; ab͕uru ulo Devid iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ulo Netan iche, na ndinyom-ha iche;

13. ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche;

14. ab͕uru nile ndi fọduru, ab͕uru ọ bula iche, na ndinyom-ha iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 12