Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 11:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Meghe uzọ-gi nile, gi Lebanon, ka ọku we ripia osisi cedar gi nile.

2. Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n'ihi na osisi cedar adawo, n'ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n'ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo.

3. Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n'ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n'ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan.

4. Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u;

5. nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha.

6. N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha.

7. M'we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n'ezie ọ bu ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M'we chiri n'onwem nkpa-n'aka abua; otù ka m'kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m'kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m'we zùa ìgwè ewu na aturu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 11