Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zefanaia 3:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Site n'ofè osimiri nile nke Etiopia ka ndi-aririọm, bú ada ndim achusara achusa, gēburu onyinye-inata-iru-ọmam.

11. N'ubọchi ahu ka ihere omume-gi nile nāgaghi-eme gi, bú nke i jiworo jehie megidem: n'ihi na mb͕e ahu ka M'gēwezuga n'etiti gi ndi-gi nāṅuri ọṅu-agha nime npakọ, i gaghi-adi kwa npako ọzọ n'ugwu nsọm.

12. M'gēme kwa ka otù ndi ewedara n'ala nke nēnweghi kwa ike fọdu n'etiti gi, ha gāb͕abà kwa n'aha Jehova.

13. Ndi Israel fọduru agaghi-eme ajọ omume, ha agaghi-ekwu kwa okwu-agha; agaghi-ahu kwa ire aghughọ n'ọnu-ha: n'ihi na ndi ahu gāzù onwe-ha makpu kwa amakpu dika aturu, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.

14. Tie nkpu ọṅù, gi ada Zaion; tie nkpu, gi Israel; ṅuria, were obi nile ṅuria ọṅu-agha, gi ada Jerusalem.

15. Jehova ewezugawo ikpé-gi nile, Ọ chughachiwo onye-iro-gi: Eze Israel, bú Jehova, nọ n'etiti gi: i gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọzọ.

16. N'ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda.

17. Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.

18. Ndi ọ nēwuta n'ihi mb͕e akara àkà ka M'gēme ka ha zukọta, bú ndi sitere na gi: bú obodo nke ibu eboro ya bu ita-uta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zefanaia 3