1. Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda.
2. M'gēkpochapusi ihe nile n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
3. M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
4. M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile;
5. na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;