Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 40:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.

24. Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.

25. O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.

26. O tiye ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu n'ulo-ikwū nzute n'iru ákwà-nb͕ochi ahu:

27. o we sure n'elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu.

28. Ọ tukwasi ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu.

29. Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n'ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n'elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 40