16. Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.
17. O rue n'ọnwa mbu n'arọ nke-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ.
18. Moses we guzo ebe-obibi ahu ọtọ, tiye ukwu-ya nile, guzo ibo-ya nile ọtọ, tiye nkpọrọ-ya nile, guzo ide-ya nile ọtọ.
19. Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n'elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.
20. O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:
21. o webata ib͕e ahu n'ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
22. O tiye table ahu n'ulo-ikwū nzute, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu, n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu.
23. O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
24. Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.
25. O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
26. O tiye ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu n'ulo-ikwū nzute n'iru ákwà-nb͕ochi ahu:
27. o we sure n'elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu.
28. Ọ tukwasi ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu.
29. Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n'ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n'elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.