Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 39:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ha site-kwa-ra n'ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, me uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, me kwa uwe nsọ nile nke Eron nwere; dika Jehova nyere Moses iwu.

2. Ọ mekwara ephod ahu, ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

3. Ha we tisa mbadamba ihe ọla-edo ahu, we bìri ya ka ọ buru eriri, ikpa n'etiti ogho anunu ahu, na n'etiti ogho ododo ahu, na n'etiti ezi ákwà ọcha ahu, ọ bu ọlu onye-ọ̀kà.

4. Ha we mere ya ubu abua ejikọtara: na nsọtu-ya abua ka ejikọtara ya.

5. Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu.

6. Ha mekwara nkume onyx ahu, nke emere ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu, nke eb͕uru ha eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di.

7. O tiye ha n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu.

8. Ọ mekwara ihe-ib͕ochi-obi ahu, ọ bu ọlu nke onye-ọ̀kà, dika ọlu aluru n'ephod ahu; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

9. Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka o bu; ha mere ihe-ib͕ochi-obi ahu ka ọ buru ihe apiajiri apiaji: ntù-aka ka ogologo-ya di, ntù-aka ka obosara-ya di kwa, mb͕e apiajiri ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 39