Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 34:6-25 Bible Nso (IGBOB)

6. Jehova we gabiga n'iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere na ezi-okwu;

7. Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.

8. Moses we me ngwa, rube isi-ya n'ala, kpọ isi ala.

9. Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa.

10. Ọ we si, Le, Mu onwem nāb͕a ndu: n'iru ndi-gi nile ka M'gālu oké ọlu di iche iche, bú nke ọ dighi mb͕e ekere ha n'uwa nile, ma-ọbu nime mba ọ bula: ndi nile ndi gi onwe-gi nọ n'etiti ha gāhu kwa ọlu Jehova, n'ihi na ihe-egwù ka ọ bu, bú nke Mu onwem nēme n'ebe i nọ.

11. Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi.

12. Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi:

13. kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:

14. n'ihi na i gaghi-akpọ isi ala nye chi ọzọ: n'ihi na Jehova, Nke Onye-ekworo bu aha-Ya, Chineke ekworo ka Ọ bu:

15. ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;

16. i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.

17. Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.

18. Ememe achicha ekoghi-eko ka i gēdebe. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib: n'ihi na ọ bu nime ọnwa Ebib ka i siri n'Ijipt puta.

19. Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa bu nkem; na anu-ulo-gi ọ bula nke bu oké, nwa nke meghere àkpà-nwa ehi ma-ọbu aturu.

20. Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n'etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka.

21. Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi: n'ilu-ọlu-ubi na n'owuwe-ihe-ubi i gākwusi.

22. I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n'ọb͕ub͕a arọ.

23. Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel.

24. N'ihi na M'gānara mba di iche iche ala-ha n'iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n'ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n'arọ.

25. Eb͕upula ọbara nke àjàm n'elu ihe nēko achicha; àjà ememe ngabiga agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 34