Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 28:15-18 Bible Nso (IGBOB)

15. I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya.

16. Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa.

17. I gāhiọgide kwa nime ya nhiọgide nkume, eriri nkume anọ: eriri sardius na topaz na carbuncle gābu eriri mbu;

18. eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 28