Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 28:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Ọlu nke onye-ọ̀kà na nkume ka a gēji b͕u eb͕ub͕u nkume abua ahu, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di: i gēme ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu.

12. I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.

13. I gēme kwa ihe ọla-edo akpara akpà:

14. na iyab͕a abua nke ọla-edo anāgwaghi agwa; dika eriri-nma ka i gēme ha, ihe emere dika udọ̀ aturu atu; i gētiye kwa iyab͕a ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu ihe ọla-edo ahu akpara akpà.

15. I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya.

16. Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa.

17. I gāhiọgide kwa nime ya nhiọgide nkume, eriri nkume anọ: eriri sardius na topaz na carbuncle gābu eriri mbu;

18. eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond;

19. eriri nke-atọ gābu jacinth na agate na amethyst:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 28