Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 27:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ide nile nke ogige ahu buruburu gabu ihe egegidere ngegide n'ọla-ọcha; nkpọye-ha gābu ọla-ọcha; ma ukwu-ha gābu ọla.

18. Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla.

19. Ihe nile nke ebe-obibi ahu n'òfùfè-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ǹtú nile nke ogige ahu, gābu ọla.

20. Ma gi onwe-gi, i gēnye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.

21. N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 27