Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 20:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.

9. Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:

10. ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:

11. n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.

12. Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

13. Gi eb͕ula madu.

14. Gi akwala iko.

15. Gi ezula ori.

16. Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.

17. Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 20