Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 19:9-21 Bible Nso (IGBOB)

9. Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n'igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M'nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel.

10. Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,

11. nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.

12. I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n'ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua:

13. ọ dighi aka gēmetu ya, n'ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n'àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n'ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n'ugwu a.

14. Moses we si n'ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha.

15. Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.

16. O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji.

17. Moses we me ka ndi Israel si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha puta izute Chineke, ha we guzo onwe-ha n'ala-ala nke ugwu ahu.

18. Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.

19. Olu opì-ike ahu we nādasi ike nke-uku, Moses nēkwu okwu, Chineke were kwa olu nāza ya.

20. Jehova we rida-kwasi ugwu Sainai, rue elu ugwu ahu: Jehova we kpọ Moses ibiaru elu ugwu ahu, Moses we rigo.

21. Jehova we si Moses, Rida, b͕ara ndim àmà, ka ha we ghara inujuru n'ebe Jehova nọ ile anya, ọtútú nime ha we da.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 19