Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 17:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. O rue, mb͕e Moses weliri aka-ya elu, na Israel kariri ike: ma mb͕e o mere ka aka-ya zuru ike, Amalek kariri ike.

12. Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n'okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n'otù akuku, ibe-ya n'akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu.

13. Joshua we me ka ike gwu Amalek n'ọnu mma-agha.

14. Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.

15. Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 17