Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 17:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Nzukọ nile nke umu Israel we si n'ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n'okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu.

2. Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova?

3. Akpiri miri we kpọ ndi Israel nku n'ebe ahu; ndi ahu we tamu ntamu megide Moses, si, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i meworo ka ayi si n'Ijipt rigota, iwere akpiri-ikpọ-nku me ka ayi na umu-ayi na anu-ulo-ayi, nwua?

4. Moses we tikue Jehova, si, Gini ka m'gēme ndi nka? ọ fọduru ihe ntà ka ha tub͕uem na nkume.

5. Jehova we si Moses, Gabiga n'iru ndim, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye Israel ka ha so gi je; nkpa-n'aka-gi kwa, nke i ji ti osimiri Nail, were ya n'aka-gi, je.

6. Le, M'gaje iguzo n'iru gi n'ebe ahu n'elu oké nkume nime Horeb, i gēti oké nkume ahu ihe, miri gēsi kwa nime ya puta, ka ndim we ṅua. Moses we me otú a n'anya ndi-okenye Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 17