Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 16:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ha si n'Ilim bulie ije, nzukọ nile nke umu Israel we ba n'ọzara Sin, nke di n'etiti Ilim na Sainai, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-abua site n'ọpupu-ha n'ala Ijipt.

2. Nzukọ nile nke umu Israel we tamu ntamu megide Moses, megide kwa Eron, n'ọzara ahu:

3. umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua.

4. Jehova we si Moses, Le, M'gaje ime ka nri si n'elu-igwe zoro unu dika miri; ndim gāpu, chikọta ihe nke otù ubọchi n'ubọchi-ya, ka M'we nwa ha, ma ha gēje ije n'iwum, ma-ọbu na ha agaghi-eje.

5. O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi.

6. Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta:

7. n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?

8. Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.

9. Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n'iru Jehova: n'ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu.

10. O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 16