Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 15:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi:I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.

8. Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo,Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo;Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.

9. Onye-iro siri,M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara:Nkpuru-obim gējuputa na ha,M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

10. I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.

11. Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova?Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ?Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.

12. I setiri aka-nri-Gi,Ala elo ha.

13. N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.

14. Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.

15. Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 15