Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 8:5-14 Bible Nso (IGBOB)

5. Jehova we gwa Moses okwu, si,

6. Weputa ndi Livai n'etiti umu Israel, me ka ha di ọcha.

7. Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n'anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha.

8. Ka ha were kwa nwa-oke ehi, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, bú utu ọka flour agwara manu, nwa-oke-ehi ọzọ ka i gēwere kwa iji chu àjà-nmehie.

9. I gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru ulo-ikwū nzute: i gākpọkọta kwa nzukọ nile nke umu Israel:

10. i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha:

11. Eron gēfé ndi Livai n'iru Jehova ibu àjà-ofufé sitere n'umu Israel, ka ha we buru ndi gēfè òfùfè nke Jehova.

12. Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha.

13. I gēguzo ndi Livai n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé ichuru Jehova.

14. I gēkewaputa kwa ndi Livai n'etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 8