Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 7:84-89 Bible Nso (IGBOB)

84. Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n'ubọchi etere ya manu, site n'aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua:

85. afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n'ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;

86. ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n'ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n'ọtùtù-ha:

87. ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua:

88. ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu.

89. Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 7