Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 6:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.

9. Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.

10. N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwetara onye-nchu-àjà nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

11. Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n'ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n'ubọchi ahu.

12. Ọ gēkewaputa-kwa-ra Jehova ubọchi nile nke nkewaputa-ya, weta kwa nwa-ebulu b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: ma ubọchi mbu nile alawo n'iyì, n'ihi na nkewaputa-ya ruru árú.

13. Nka bu kwa iwu onye-Nazirait, n'ubọchi ozùzù nke ubọchi nile nke nkewaputa-ya: agēme ka ọ bia n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute:

14. ọ gēweta kwa nso Jehova onyinye-ya iji biaru nso, otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na otù nwa-nne-aturu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nmehie, na otù ebulu zuru okè ka ọ buru àjà-udo,

15. na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

16. Onye-nchu-àjà gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, me àjà-nmehie-ya, na àjà-nsure-ọku-ya:

17. ọ gēme kwa ebulu ahu ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo anāchuru Jehova, tiyere nkata achicha ekoghi-eko ahu: onye-nchu-àjà gēme kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

18. Onye-Nazirait ahu gākọpu kwa isi nke nkewaputa-ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ọ gēwere kwa agiri-isi nke isi nke nkewaputa-ya, tiye ya n'elu ọku nke di n'okpuru ihe àjà nke àjà-udo ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 6