Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 4:25-28 Bible Nso (IGBOB)

25. ha gēbu kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibim, na ulo-ikwū nzute, ihe-nkpuchi-ya, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal nke dikwasiri ya n'elu, na ákwà-nkwuchi di n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute;

26. na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n'onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n'akuku ebe-obibi ahu na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya.

27. N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.

28. Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu ndi Giashon n'ulo-ikwū nzute: ihe-ndebe-ha gādi n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 4