Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 4:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2. Guta ọnu-ọgugu umu Kohat site n'etiti umu Livai, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

3. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n'ulo-ikwū nzute.

4. Nka bu òfùfè umu Kohat n'ulo-ikwū nzute, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile:

5. na nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū Eron gābà kwa nime, ya na umu-ya ndikom, ha gākwuda ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, were ya kpuchie ib͕e ihe-àmà ahu,

6. tiye kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya, b͕akwasi kwa ákwà anunu anunu n'elu, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime

7. N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya:

8. ha gāb͕akwasi kwa n'elu ha ákwà uhie, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, ha gētiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime.

9. Ha gēwere kwa ákwà anunu, kpuchie ihe-idọba-oriọna nke ihe ahu nēnye ìhè, na oriọna-ya nile, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, na ihe-manu-ya nile, nke ha were jere ya ozi:

10. ha gētiye kwa ya na ihe-ya nile nime ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tukwasi ya n'ihe eji bū ya

11. Ọ bu kwa n'elu ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime:

12. ha gēwere kwa ihe nile nke ije-ozi ahu, nke ha ji je ozi n'ebe nsọ ahu, tiye ha nime ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ha, tukwasi ha n'ihe eji bū ha.

13. Ha gēkpopu kwa ntu n'ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n'elu ya ákwa ododo:

14. ha gētiye kwa n'elu ya ihe nile ya, nke ha ji je ozi n'akuku ya, bú ihe-igu-ọku-ya nile, na ndudu-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya, ihe nile nke ebe-ichu-àjà ahu; ha gāb͕akwasi kwa n'elu ya ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tinye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 4