Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 34:10-22 Bible Nso (IGBOB)

10. Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:

11. ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:

12. ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.

13. Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:

14. n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;

15. ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.

16. Jehova we gwa Moses okwu, si,

17. Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.

18. Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.

19. Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.

20. Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.

21. Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.

22. Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 34