Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 34:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)

3. akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu:

4. ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:

5. ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.

6. Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu

7. Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n'oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa:

8. unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:

9. ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu.

10. Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:

11. ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 34